Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 23:18 - Bible Nso

18 Ewebatala onyinye enyere nwayi nākwa iko, ma-ọbu ihe eretara na nkita, n'ulo Jehova, bú Chineke-gi, imezù nkwa ọ bula: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ha abua bu kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ị gaghị ewebata nʼụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, onyinye ọbụla site nʼego nwanyị na-agba akwụna kpatara, maọbụ site nʼego nwoke ahụ na-edebe onwe ya dịka akwụna nye ndị ikom ibe ya kpatara, iji mezuo nkwa ọbụla. Nʼihi na ha abụọ bụ ihe rụrụ arụ nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 23:18
21 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, ndi edoro nsọ ikwa iko di n'ala: ha mere dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.


N'ihi na nkita dim buruburu: Nzukọ ndi nēme ihe ọjọ ab͕awom buruburu; Ha nādupú akam abua na ukwum abua.


Dika nkita nke chighariworo ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, Otú a ka onye-nzuzu di nke nēme kwa ihe uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ ọzọ.


N'ihi na Mu onwem, Jehova, nāhu ikpé ziri ezi n'anya, anamakpọ nnapu-n'ihe-ike n'ajọ omume asì; M'gēnye kwa ha ugwọ-ọlu-ha n'ezi-okwu, ọ bu kwa ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Mu na ha gāb͕a.


Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile.


Gi na nwoke edinala dika nwoke na nwayi nēdina ihe-árú ka ọ bu.


Emela ka nwa-gi nwayi ghara idi nsọ, ime ka ọ ghọ nwayi nākwa iko; ka ala-gi we ghara ikwa iko, ka ala-gi we ghara kwa ijuputa na nzube ọjọ.


Nwoke ọ bula nke ya na nwoke nēdina, dika nwoke na nwayi nēdina, ihe-árú ka ha abua meworo: aghaghi ime ka ha nwua; ọbara-ha gādikwasi ha.


Ma ọ buru na àjà nke onyinye-ya iji biaru nso bu nkwa ma-ọbu àjà-afọ-ofufo, n'ubọchi ọ nēweta nso àjà-ya-ka agēri ya: n'echi-ya ka agēri kwa nke fọduru nime ya:


Ọ bu kwa arusi-ya nile apiri api ka agētipia, ọ bu kwa onyinye ikwa-iko ya nile ka agēsure n'ọku, ọ bu kwa arusi-ya nile ka M'gēme ebe tọb͕ọrọ n'efu: n'ihi na o siworo n'onyinye nwanyi nke nākwa iko chikọta ha, ọ bu kwa rue onyinye nwanyi nākwa iko ka ha gālaghachi.


Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;


Ma onye anābu ọnu ka onye-nghọḅu ahu bu, nke oké di n'ìgwè aturu-ya, ma ọ nēkwe nkwa, we chuara Onye-nwe-ayi àjà ihe biriri ebibi: n'ihi na eze uku ka M'bu, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, aham di kwa egwu n'etiti mba nile.


Unu enyela nkita ihe di nsọ, unu atuda-kwa-la pearl-unu n'iru ezì, ka ha ghara izọkwasi ha n'ukwu-ha ma eleghi anya, we chigharia, dọka unu.


ọ bu kwa n'ebe ahu ka unu gēweta àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa nile unu, na onyinye-afọ-ofufo nile unu, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-unu na ìgwè ewu na aturu-unu:


ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Mb͕e i gēkwe Jehova, bú Chineke-gi, nkwa, alala azu n'ikwughachi ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, aghaghi iju ase ya n'aka-gi; ọ gābu kwa nmehie nime gi.


Lezienu nkita ahu nile anya, lezienu ndi-ọlu ọjọ ahu anya, lezienu obibì-aru ahu anya:


Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, Ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, buru kwa nne-ezì nke chighariri ọzọ n'ituru n'apiti mb͕e ọ sachasiri onwe-ya.


N'azu obodo ka ha di, bú nkita nile, na ndi nile nāgwọ nsi, na ndi nile nākwa iko, na ndi-ob͕u-madu nile, na ndi nēkpere arusi, na onye ọ bula nke nāhu ugha n'anya nēme kwa ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan