Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 23:15 - Bible Nso

15 Emechibidola orù nye onye-nwe-ya, bú onye naputaworo onwe-ya n'aka onye-nwe-ya b͕akute gi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 23:15
10 Iomraidhean Croise  

Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura, Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.


Tisie nkpu ike, kpọ nkpu ọṅù, gi nwanyi bi na Zaion n'ihi na onye uku n'etiti gi ka Onye Nsọ nke Israel bu.


Kama n'ebe ahu ka Onye di ebube, bú Jehova, gānọduru ayi, dika ebe ọtutu osimiri na uzọ di iche iche miri si erù nke sara mbara n'aka abua; ub͕ọ-umara agaghi-aga nime ya, ub͕ọ di ebube agaghi-agabiga kwa n'elu ya.


M'ganējeghari n'etiti unu, M'gābu-kwa-ra unu Chineke, unu onwe-unu gābu-kwa-ram otù ndi.


Eguzo-kwa-la n'abu-uzọ, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; emechibido-kwa-la ndi-ya fọduru nye n'aka ndi-iro-ha n'ubọchi ahuhu.


Gi onye anya-Gi abua di ọcha kari ihu ihe ọjọ, Onye nāpughi kwa ilegide nmeb͕u anya, n'ìhi gini ka I nēlegide ndi nāghọb͕u aghọb͕u? n'ìhi gini ka I nāb͕a nkiti mb͕e onye nēmebi iwu nēloda onye di ezi omume kari ya;


Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.


ma nwoke ma nwayi, unu gāchupu ha, n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka unu gāchupu ha je; ka ha we ghara imeru ọmuma-ulo-ikwū-ha, nke Mu onwem bi n'etiti ha.


ọ gēbiyere gi, n'etiti gi, n'ebe ahu nke ọ gārọputa n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, n'ebe di ya nma: emela ya ihe-ike.


Devid we si ya, Ì gēme ka m'ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe? Ọ si, Were Chineke ṅuaram iyi, na i gaghi-eme ka m'nwua, na i gaghi-emechibidokwam nye n'aka onye-nwem, m'gēme kwa ka i ridakuru usu ahu ndi nāpunara madu ihe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan