Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 22:8 - Bible Nso

8 Mb͕e i nēwu ulo ọhu, i gēme-kwa-ra elu-ulo-gi ihe-nb͕ochi buruburu, ka i ghara ime ka ọbara di n'ulo-gi, mb͕e madu gēsi na ya da.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Mgbe i wuru ụlọ, wuokwa ihe mgbochi gburugburu elu ya, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara isi nʼelu ya dapụ, si otu a wetara ụlọ na onye nwe ya ikpe ọmụma nke iwufu ọbara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 22:8
20 Iomraidhean Croise  

O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.


Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi.


Ibu eboro ndagwurugwu nke ọhù. Ọ bu kwa gini nēme gi, na i rigoworo n'elu ulo nile, ka i ra?


ulo nile nke Jerusalem na ulo nile ndi-eze Juda, nke ruru árú, gādi kwa ka ebe Tofet, bú ulo nile nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì uto n'elu-ha nye usu nile nke ihe elu-igwe, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu.


Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Okwu M'nāgwa unu n'ọchichiri, kwuenu ya n'ìhè: ihe unu nānu kwa na nti, kwusanu ya n'elu ulo.


Mb͕e ha apughi ikuru ya biakute Ya n'ihi ìgwè madu, ha we kpupu elu ulo ebe Ọ nọ: mb͕e ha gwupusiri ya, ha we buda ute nke onye akuku-aru-ya nwuru anwu nēdina.


Ma n'echi-ya, mb͕e ndi ahu nọ n'ije-ha, nābiaru kwa obodo ahu nso, Pita rigoro n'elu ulo ikpe ekpere, n'ihe ra ka oge hour nke-isi:


Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.


Unu aghọla ndi nēme ndi-Ju, ma-ọbu ndi-Grik, ma-ọbu nzukọ Chineke, ka ha su ngọngọ:


i ghaghi íme ka nne-nnunu la, ma umu-ya ka i gēwere n'onwe-gi; ka o we diri gi nma, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya.


Aghala uzọ nkpuru abua n'ubi-vine-gi: ka ojuju nke nkpuru i nāgha na ihe-ọmume ubi-vine-gi we ghara idi nsọ.


ka unu we nwa ihe ha na ibe-ha di iche; ka unu we di ọcha n'obi ghara kwa isu ngọngọ rue ubọchi nke Kraist;


unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.


Ha we si n'ebe di elu ahu rida n'obodo, o we kpayere Sọl uka n'elu-ulo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan