Diuteronomi 21:5 - Bible Nso5 ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ. Faic an caibideil |
Ma mb͕e ise-okwu ọ bula gēru unu nti site n'umu-nne-unu ndi bi n'obodo-ha, n'etiti ọbara na ọbara, n'etiti iwu na ihe enyere n'iwu, na ukpuru na ikpé, unu gēme kwa ka ha ghọta, ka ikpe we ghara ima ha n'ebe Jehova nọ, iwe ewe dikwasi unu, dikwasi kwa umu-nne-unu: otú a ka unu gēme, ikpe agaghi-ama kwa unu.
O we sim, Ime-ulo nile nke Ugwu na ime-ulo nile nke Ndida, nke di n'iru ebe ahu ekewapuru ekewapu, ime-ulo ahu bu ime-ulo nsọ, ebe ndi-nchu-àjà ndi nọ nso Jehova gēri ihe nile nke kachasi ihe nsọ nile nsọ: n'ebe ahu ka ha gādọba ihe nile kachasi ihe nsọ nile nsọ, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nmehie, na àjà-ikpe-ọmuma; n'ihi na ebe ahu di nsọ.