Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 21:4 - Bible Nso

4 ndi-okenye obodo ahu gākpudata nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nime ndagwurugwu miri nērù mbe nile, nke anālughi ọlu-ubi, nke anāghaghi kwa nkpuru nime ya, ha gāb͕aji kwa olu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu n'ebe ahu nime ndagwurugwu ahu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 21:4
6 Iomraidhean Croise  

N'ihi na, le, Mu onwem diri unu, M'gēche kwa unu iru, agālu kwa unu dika ubi, gha unu ihe:


ọ gēru kwa, na obodo ahu nke dikachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, ndi-okenye obodo ahu gēwere kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi, nke akējighi ya lu ọlu-ubi, nke akādọghi kwa ihe nime yoke;


ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi:


N'ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu bayere nmehie, nání otù mb͕e, Onye ezi omume n'ihi ndi ajọ omume, ka O we kuru ayi biakute Chineke; n'ihi na emere ka Ọ nwua anwu n'anu-aru-Ya, ma emere ka Ọ di ndu na mọ-Ya;


Ma ub͕u a, werenu ihe me otù ub͕ọ-ala ọhu, chiri kwa nne-ehi abua nke nēnye umu ara, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ha, kegide-kwa-nu ehi ahu n'ub͕ọ-ala, me ka umu-ha si n'iso ha n'azu lata n'ulo:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan