Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 21:22 - Bible Nso

22 Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ọ bụrụ na nwoke ọbụla emee ihe ọjọọ kwesiri ọnwụ, ọ bụrụ na e kpee ya ikpe ọnwụ, kwụgbuo ya nʼosisi,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 21:22
20 Iomraidhean Croise  

ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.


Rizpa nwa-nwayi Aia we chiri ákwà-nkpe, b͕asara onwe-ya n'elu oké nkume, site na nmalite owuwe-ihe-ubi rue mb͕e esi n'elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kweghi kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n'ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n'abali.


ka enye ayi ndikom asa sitere n'umu-ya, ayi gākwuba kwa ha nye Jehova nime Gibea Sọl, onye Jehova rọputara. Eze we si, Mu onwem gēnye unu ha.


o we nye ha n'aka ndi Gibeon, ha we kwuba ha n'ugwu n'iru Jehova: ha asa we da n'otù: ma emere ka ndi ahu nwua n'ubọchi owuwe-ihe-ubi, n'ubọchi mbu, na nmalite obìbì ọka barley.


Devid we nye umu-okorọbia-ya iwu, ha we b͕ue ha, bipu aka-ha na ukwu-ha, kwuba ha n'akuku ọdọ-miri nime Hebron. Ma ha were isi Ish-boshet, lìe ya n'ílì Abnea nime Hebron.


Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi.


gini bu uche-unu? Ha we za, si, O kwesiri inwu ọnwu.


Unu nuru nkwulu ahu: gini bu uche-unu? Ha nile we ma Ya ikpé, si na O kwesiri inwu ọnwu.


Ma mb͕e ha biara n'ebe anākpọ Okpokoro-isi, n'ebe ahu ka ha kpọgidere Ya na ndi ahu nālu ọlu ọjọ n'obe, otù onye n'aka-nri-Ya na onye ọzọ n'aka-ekpe-Ya.


onye m'huru na anēbo ya ebubo bayere ajuju di iche iche nke iwu-ha, ma o nweghi ihe eboro ya kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.


Ya mere ọ buru na emem ajọ omume, ọ buru kwa na emewom ihe kwesiri ọnwu, ariọghm ib͕anari ọnwu: ma ọ buru na ọ dighi ihe bu ezi-okwu n'ebubo ndikom ndia nēbom, ọ dighi onye ọ bula puru iwerem nye ha n'amara. Ọ bu Sisa ka m'nākpọku.


Ma mu onwem huru na o meghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu: ma mb͕e ya onwe-ya kpọkuru Ọgustọs, m'we kpebìe iziga ya.


mb͕e ha wezugasiri onwe-ha, we kwurita n'etiti onwe-ha, si; Nwoke a emeghi ihe ọ bula kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.


ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.


ma ọ dighi ihe i gēmere nwa-ab͕ọghọ ahu; ọ dighi nmehie ọnwu diri nwa-ab͕ọghọ ahu: n'ihi na dika mb͕e nwoke nēbili imegide madu-ibe-ya, we b͕ue ya eb͕u, otú a ka okwu a di:


Emesia Joshua we tib͕ue ha, me ka ha nwua, kwuba ha n'osisi ise: ha we kwugide n'elu osisi ise ahu rue anyasi.


O rue, na mb͕e anyanwu nāda, na Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi ise ahu weda ha, tubà ha n'ọb͕à ahu ebe ha zoro onwe-ha, we tukwasi nkume uku n'ọnu ọb͕à ahu, rue ubọchi nke ta.


Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta.


Ọ dighi nma, bú ihe a nke i meworo. Jehova nādi ndu, ndi kwesiri ọnwu ka unu bu, n'ihi na unu edebeghi onye-nwe-unu nke-ọma, bú onye Jehova etere manu. Ma ub͕u a, le ebe ube eze di, na ite miri nke di n'akuku isi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan