Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 20:5 - Bible Nso

5 Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe ahụ, ndị ọchịagha ga-esi otu a gwa ndị agha Izrel okwu sị ha, “O nwere onye ọbụla nʼime unu wuru ụlọ ọhụrụ ọ na-edobeghị nsọ nye Onyenwe anyị? Ka onye dị otu a laghachi nʼụlọ ya. Ka onye ahụ ghara ịnwụ nʼagha hapụ ụlọ ya, ka nwoke ọzọ doo ya nsọ nye Onyenwe anyị!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 20:5
8 Iomraidhean Croise  

Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.


M'gēbuli Gi elu, Jehova; n'ihi na I dọgowom n'elu, I meghi kwa ka ndi-irom ṅuriam.


Moses we wesa ndi-nlekọta usu-ndi-agha ahu iwe, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, ndi nēsi n'usu-ndi-agha nke agha ahu bia.


Ndi-nlekọta ndi nēlekọta usu nile nke nnù ndikom nke usu-ndi-agha abua na ọgu iri, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, we bia nso Moses:


M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.


I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume.


Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.


buga-kwa-ra onye-isi usu nnù ndikom na ọgu ise nke ha cheese iri ndia, lekọta kwa umu-nne-gi ma ha nọ n'udo, nara kwa ihe-mbe-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan