Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 20:20 - Bible Nso

20 Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Naanị osisi na-adịghị amị mkpụrụ ka ị ga-egbutu, nke a na-adịghị eri mkpụrụ ya eri. Jiri ha meere onwe gị ngwa ọgụ, dịka ubibi, na nkwasa, na ihe unu ji etitu mgbidi obodo ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 20:20
10 Iomraidhean Croise  

Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.


O me kwa nime Jerusalem ihe-agha echèputara, bú nchèputa nke onye nēchèputa ihe, idi n'elu ulo-elu nile, na n'elu nkuku mb͕idi nile, iji b͕a àkú na nkume uku. Aha-ya we pua rue ebe di anya; n'ihi na eyere ya aka n'uzọ di ebube, rue mb͕e ọ di ike.


otù obodo ntà di, ndikom di nime ya di kwa ole-na-ole; ma otù eze uku biara imegide ya, we b͕a ya buruburu, wu kwa ebe ewusiri ike imegide ya:


N'ihi ya ka Jehova kwuru okwu bayere eze Asiria otú a, si, Ọ gaghi-abà n'obodo a, ọ gaghi-ab͕a otù àkú n'ebe ahu, ọ gaghi-ewere kwa ọta bia n'iru ya, ọ gaghi-awukọta kwa ihe-ntukọba imegide ya.


N'ihi na okwu di otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, kwuru bayere ulo nile nke obodo a, baye-kwa-ra ulo nile nke ndi-eze Juda, nke akwadaworo imegide obo-ihe nile atuliri atuli na imegide mma-agha, si:


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.


Fero agaghi-achiri kwa oké usu-ndi-agha-ya na nkpọkọta-madu-ya bara uba me ya ihe ọ bula n'agha ahu, mb͕e ha gāwukọta obo-ihe, wue ulo-agha, ibipu ọtutu madu.


Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.


Mb͕e i gānọchigide obodo n'agha ọtutu ubọchi, n'ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n'ifekwasi ha anyu-ike; n'ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n'ihi na osisi nke di n'ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n'iru gi na nnọchigide-n'agha ahu?


Mb͕e agāhuta otù onye eb͕uru eb͕u ka ọ dara n'ọhia n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i we nweta ya, ma amaghi onye tib͕uru ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan