Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 20:19 - Bible Nso

19 Mb͕e i gānọchigide obodo n'agha ọtutu ubọchi, n'ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n'ifekwasi ha anyu-ike; n'ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n'ihi na osisi nke di n'ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n'iru gi na nnọchigide-n'agha ahu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ị nọchibidoro obodo ọbụla ogologo oge, na-ebu agha megide ya maka iwere ya, ebibila osisi na-amị mkpụrụ dị nʼime ya site nʼiji anyụike gbutuo ha. Nʼihi na i nwere ike rie mkpụrụ osisi ha, egbutula ha. Osisi dị nʼọhịa ha ọ bụ ndị mmadụ, na ị ga-anọchibido ha?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 20:19
11 Iomraidhean Croise  

Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula.


Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Gbutuenu osisi-ya nile, wukọta obo-ihe imegide Jerusalem: nka bu obodo ahu agēleta; ọ bu nání nmeb͕u n'etiti ya.


Mb͕e Ọ huru otù osisi fig n'uzọ, Ọ biarue ya aru, ma Ọ hughi ihe ọ bula n'elu ya, ma-ọbughi nání akwukwọ ndu; O we si ya, Ka nkpuru ghara iputa n'elu gi ọzọ ebighi-ebi. Osisi fig ahu we kpọnwua n'otù mb͕e ahu.


Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.


ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.


Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.


ndi Ijipt we mejọ ayi, weda ayi n'ala, tukwasi ayi òfùfè siri ike:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan