Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 20:14 - Bible Nso

14 nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma ụmụ nwanyị niile na ụmụntakịrị niile, anụ ụlọ niile na ihe nkwata niile nke ndị obodo ahụ ka ị ga-edebere onwe gị. Ị ga-ewerekwa ihe nkwata nke Onyenwe anyị Chineke gị nyere site nʼaka ndị iro gị mee ihe dị gị mma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 20:14
15 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu.


Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga: Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha.


Ha we chiri ihe nile akwatara n'agha, na ihe-nweta nile, ma n'etiti madu ma n'etiti anumanu.


Ha we wetara Moses, weta-kwa-ra Eleeza, bú onye-nchu-àjà, weta-kwa-ra nzukọ umu Israel, ndi adọtara n'agha, na ihe-nweta, na ihe akwatara n'agha, rue ọmuma-ulo-ikwū, rue ala ihe nādighi nke Moab nke di n'akuku Jọdan na nso Jeriko.


Moss we si ha, Ùnu emewo ka ndinyom nile di ndu?


Ma umu-ntakiri nile n'etiti ndinyom, ndi nāmaghi ndina nwoke, menu ka ha diri unu ndu.


Umu Israel we dọta ndinyom Midian na umu-ntakiri-ha n'agha; ọ bu kwa anu-ulo-ha nile, na anumanu-ha nile, na àkù-ha nile, ka ha lutara n'agha.


É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya.


nání anu-ulo ka ayi lutara n'agha n'onwe-ayi, ha na ihe-nkwata obodo nile nke ayi were.


Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia.


Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n'agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu.


gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n'ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu.


i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan