Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 2:14 - Bible Nso

14 Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Iri afọ atọ na asatọ gasịrị, site na mgbe anyị hapụrụ Kadesh Banea ruo mgbe anyị gafere Ndagwurugwu Zered! Nʼoge a, ọgbọ ndị ikom ahụ niile na-alụ agha anwụchaala site nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka Onyenwe anyị ṅụrụ ha nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 2:14
24 Iomraidhean Croise  

O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ, Ime ka ha da n'ọzara:


Me ka ayi ṅuria dika ubọchi nile si di I wedaworo ayi n'ala nime ha, Na dika arọ si di nke ayi huworo ihe ọjọ nime ha.


I nēme ka madu laghachi n'ájá; I we si, Laghachinu, umu madu.


N'ihi na ubọchi-ayi nile agawo nime nrubiga-ókè nke iwe-Gi: Ayi emewo ka arọ nile ayi gwusia dika otù nze-ume.


N'ihi ya aṅurum iyi n'iwem, si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli


Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n'ọzara, si, na M'gaghi-eme ka ha ba n'ala ahu nke M'nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile;


Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'ulo-ikwū nzute, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, n'arọ nke-abua nke ọpupu ha puru n'Ijipt, si,


Ha we je biakute Moses, biakute kwa Eron, biakute kwa nzukọ nile nke umu Israel, rue ọzara Peran, rue Kedesh; we weghachiri ha na nzukọ Israel nile okwu, me kwa ka ha hu nkpuru ala ahu.


Ndikom ahu ndi nēsi n'ala Ijipt rigoputa, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ha agaghi-ahu ala ahu ma-ọli nke M'ṅuru Abraham, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, iyi inye ha; n'ihi na ha esozughm n'azu:


Ma ihe ndi kari n'etiti ha adighi Chineke ezi nma: n'ihi ya akwaturu ha n'ọhia.


Ayi we si na Horeb bulie ije, we je ije nime ọzara uku ahu di egwu nke unu huru, n'uzọ ugwu ndi-Amorait, dika Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu; ayi we biarue Kedesh-banea.


Ọ bu ubọchi iri na otù site na Horeb rue Kedesh-banea ma i si n'uzọ ugwu Sia.


Unu we biri na Kedesh ọtutu ubọchi, dika ubọchi nile si di nke unu biri n'ebe ahu.


Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered.


Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel,


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.


Ha we tikue Jehova, O we tiye oké ọchichiri n'etiti unu na ndi Ijipt, me ka oké osimiri biakwasi ha, O we kpuchie ha; anya-unu hu-kwa-ra ihe M'mere n'Ijipt: unu we biri n'ọzara ọtutu ubọchi.


Nka bu kwa ihe kpatara Joshua ji bìe úgwù: ndi Israel nile ndi nēsi n'Ijipt puta, ndi bu ndikom, bú ndikom agha nile, nwuru n'ọzara n'uzọ, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.


N'ihi na ọgu arọ abua ka umu Israel jere ije n'ọzara, rue mb͕e mba ahu nile gwusiri, bú ndikom agha ahu ndi nēsi n'Ijipt puta, n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ndi Jehova ṅuru iyi na Ọ gaghi-ekwe ka ha hu ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi na Ọ gēnye ayi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


Ma anamezube ichetara unu, ọ bu ezie na unu matara ihe nile nání otù mb͕e, na Onye-nwe-ayi, mb͕e Ọ zọputarari otù ndi n'ala Ijipt, emesia O we la ndi nēkweghi ekwe n'iyì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan