Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 2:11 - Bible Nso

11 Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 A na-eche na ha bụ ndị Refaim, dịka ndị Anak, ma ndị Moab na-akpọ ha ndị Emim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 2:11
10 Iomraidhean Croise  

N'arọ nke-iri-na-anọ Kedoalaoma we bia, ya na ndi-eze ndi ya na ha yikọrọ, ha tib͕ue Refaim n'Ashterot-Kanaim, na Zuzim nime Ham, na Imim nime Shave-kiriataim,


Nefilim nọ n'uwa na mb͕e ahu, ha nọ kwa ma emesia, mb͕e umu-ndikom nke Chineke nābakuru umu-ndinyom nke madu, mb͕e ha nāmukwara ha umu: ndi ahu bu ndi-dike ahu ndi nọri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ndi amara aha-ha.


Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.


Ha we rigo nime Negeb, biarue Hebron; ma n'ebe ahu ka Ahiman na Sheshai na Talmai, bú umu Anak, nọ (Ma ewuru Hebron arọ asa tutu ewue Zoan n'Ijipt.)


Otú ọ di, ndi bi n'ala ahu di ike, ewusi-kwa-ra obodo nile ha ike, ha di kwa uku ri nne: ọzọ kwa, umu Anak ka ayi huru n'ebe ahu.


N'ebe ahu ka ayi hu-kwa-ra ndi-Nefilim, bú umu Anak, ndi sitere na ndi-Nefilim: ayi we di n'anya onwe-ayi dika ogugu, ọ bu kwa otú a ka ayi di n'anya-ha.


Òle ebe ayi onwe-ayi nārigo? umu-nne-ayi emewo ka obi-ayi ghara idi ike, si, Ọ bu ndi di uku di kwa ogologo kari ayi, na obodo uku ewusiri ike rue elu-igwe; ọzọ kwa, umu Anakim ka ayi huru n'ebe ahu.


(Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim;


(N'ihi na nání Og, bú eze Beshan, ka arapuru site na ndi fọduru nke Refaim; le, ihe-ndina-ya bu ihe-ndina ígwè; ihe-ndina ahu, ọ̀ dighi na Raba nke umu Amon? cubit iteghete ka ogologo-ya di, cubit anọ ka obosara-ya di kwa, dika cubit nke nwoke si di.)


otù ndi di uku di kwa ogologo, bú umu ndi Anak, ndi gi onwe-gi mara, ndi gi onwe-gi nuwo-kwa-ra okwu bayere ha, si, Ònye gēguzo onwe-ya n'iru umu Anak?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan