ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.
Ọ buru kwa na Jehova, bú Chineke-gi, eme ókè-ala-gi ka ọ sa mbara, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi, O we nye gi ala ahu nile nke O kwuru, si na Ọ gēnye nna-gi-hà;
M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.