Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 19:6 - Bible Nso

6 ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 19:6
7 Iomraidhean Croise  

Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.


Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n'aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.


dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n'oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n'osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n'otù nime obodo ndia, we di ndu:


N'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.


Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi;


Ma mb͕e onye-ọ́bọ̀ ọbara gāchu ya n'azu, ha agaghi ekwe ka ob͕u-madu ahu ba n'aka-ya; n'ihi na ọ bu n'amaghi-ama ka o tib͕uru madu-ibe-ya, ma ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan