Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 19:4 - Bible Nso

4 Nka bu kwa okwu bayere ob͕u-madu, nke gāb͕alaga n'ebe ahu, we di ndu: onye nēb͕u madu-ibe-ya n'amaghi-ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 19:4
12 Iomraidhean Croise  

Jekob we hu iru Leban, ma, le, ọ dighi n'ebe ọ nọ dika ọ di na mb͕e gara aga.


Nwayi ahu we si, Biko, ka eze cheta Jehova, bú Chineke-gi, ka onye-ọ́bọ̀ ọbara ghara ibibi nke-uku, ka ha we ghara ikpochapu nwam nwoke. Devid we si, Jehova nādi ndu, ọ dighi otù nime agiri-isi nwa-gi gāda n'ala.


Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel.


N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.


Obodo nile ahu gābu-kwa-ra unu ebe-nb͕abà agēsi n'aka onye-ọ́bọ̀ b͕alaga; ka ob͕u-madu we ghara inwu, rue mb͕e ọ gēguzo n'iru nzukọm ka ekpe ya ikpe.


Jehova we gwa Moses okwu, si,


I gēdoziri onwe-gi uzọ, kè kwa ókè-ala nke ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēme gi ka i keta, uzọ atọ, ka ob͕u-madu ọ bula we b͕alaga n'ebe ahu.


dika mb͕e ya na ibe-ya nābà n'oké ọhia ikpọwa nkú, aka-ya we fé anyu-ike ib͕utu osisi, anyu-ike, bú ígwè, we b͕upu n'osisi ahu, we rue madu-ibe-ya aru, o we nwua; onye ahu gāb͕alaga n'otù nime obodo ndia, we di ndu:


ka onye-ọ́bọ̀ ọbara we ghara ichu ob͕u-madu ahu n'azu, mb͕e obi-ya di ọku, o we rue ya aru, n'ihi na uzọ di anya, ọ we tipu ndu-ya; ma ikpe ọnwu amaghi ya, n'ihi na ọ kpọghi ya asì na mb͕e gara aga.


ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu:


Nání, ókè gādi n'etiti unu na ya, dika nnù cubit ise n'ọtùtù: unu abiarula nso ya, ka unu we mara uzọ nke unu gēsi je; n'ihi na unu agabigaghi n'uzọ a na mb͕e gara aga.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan