Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 18:8 - Bible Nso

8 Òkè dika òkè-ya ka ha gēri, nāgughi ihe-ya nile erere nke o nwetara n'aka nna-ya-hà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ ga-esokwa keta oke a na-ekenye ndị Livayị bi nʼobodo ahụ, nʼagbanyeghị na ọ na-enweta ego site nʼorire e rere ihe onwunwe ezinaụlọ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 18:8
11 Iomraidhean Croise  

O we si ndi Juda, bú ndi bi na Jerusalem, ka ha nye òkè ndi-nchu-àjà na ndi Livai, ka ha we di ike n'iwu Jehova.


Ewe me ndikom ufọdu n'ubọchi ahu ka ha buru ndi nēlekọta ime-ulo nile nke idebe àkù, na idebe àjà-nbuli nile, na ibede nkpuru mbu, na idebe otù uzọ n'uzọ iri nile, ichikọbata nime ha, dika ubi obodo nile si di, òkè nile nke iwu nyere ndi-nchu-àjà na ndi Livai: n'ihi na ọṅù Juda di n'ihi ndi-nchu-àjà na n'ihi ndi Livai, bú ndi nēguzo eguzo.


Israel nile n'ubọchi Zerubabel, na n'ubọchi Nehemaia, nēnye kwa òkè nke ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya: ha nēdo-kwa-ra ndi Livai ihe nsọ; ndi Livai nēdo-kwa-ra umu Eron ihe nsọ.


Otù uzọ n'uzọ iri ihe nile nke ala, site na nkpuru-ọghigha nke ala, ma ọbu site na nkpuru osisi, ihe Jehova nwere ka ọ bu: ọ bu ihe nsọ diri Jehova.


O gēsi kwa na ya weta nso otù nime onyinye ọ bula iji biaru nso ka ọ buru àjà-nbuli ibuliri Jehova; onye-nchu-aja nke nāwusa ọbara àjà-udo, ya onwe-ya gēnwe ya.


Ma umu Livai, le, ha ka M'nyeworo otù uzọ n'uzọ iri nke ihe nile n'Israel, ibu ihe-nketa, dika ihe-nkwughachi òfùfè-ha, nke ha onwe-ha nēfè, bú òfùfè nke ulo-ikwū nzute.


Nọgide-kwa-nu n'ulo ahu, nēri nāṅu kwa ihe ha nēnye umu: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ugwọ-ọlu-ya. Unu esila n'otù ulo ba n'ulo ọzọ.


ọ gēje kwa ozi n'aha Jehova, bú Chineke-ya, dika umu-nne-ya nile, bú ndi Livai, ndi nēguzo n'ebe ahu n'iru Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan