Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè.
Jehova we si Setan Ì tukwasiwo obi-gi n'aru orùm, bú Job? na ọ dighi onye di ka ya n'uwa, ọ bu nwoke zuru okè, zi kwa ezi, nke nātu egwu Chineke, nēsi kwa n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya.
Ọ bughi na anataram ya-ri, ma-ọbu na emewom ka m'zue okè ub͕u a: ma anamab͕aso, ka m'we jide, ma ọ buru na ọ gēkwem, ihe ahu nke Kraist Jisus jide-kwa-ram n'ihi ya.
Ya mere, ka ayi ra, bú ndi tozuru okè, ka ayi tukwasi uche na nka: ọ buru kwa na unu tukwasi uche n'ihe ọ bula n'uzọ di iche, ọbuná nka ka Chineke gēkpughere unu:
Ma ub͕u a, nātunu egwu Jehova, nēfè-kwa-nu Ya òfùfè n'izu-okè na ezi-okwu: wezuga-kwa-nu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè n'ofè Osimiri ahu, na n'Ijipt; ma fènu Jehova òfùfè.