Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 18:1 - Bible Nso

1 Ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, bú ebo Livai nile, ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa ha gēsoro Israel nwe: àjà-ọku nile nke Jehova na ihe-nketa-Ya ka ha gēri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ndị nchụaja bụ ndị Livayị, na ndị ebo Livayị niile agaghị enwe oke maọbụ ihe nketa ọbụla dịka ebo ndị ọzọ nʼIzrel. Ihe onyinye ịchụ aja niile e wetara nʼihu Onyenwe anyị site nʼọkụ bụ ihe nketa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 18:1
12 Iomraidhean Croise  

ọzọ, agaghi-ebipu n'ulo ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, n'irum onye nwe isure àjà-nsure-ọku, na isure onyinye-inata-iru-ọma dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì, utọ, na ichu àjà ubọchi nile.


Ọ gāghọ-kwa-ra na ihe-nketa; Mu onwem bu ihe-nketa-ha: ọ dighi kwa ihe-onwunwe unu gēnye ha n'Israel; Mu onwem bu ihe-onwunwe-ha.


Jehova we si Eron, I gaghi-eketa ihe n'ala-ha, ọ dighi kwa òkè i gēnwe n'etiti ha: Mu onwem bu òkè-gi na ihe-nketa-gi n'etti umu Israel.


Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru: n'ihi na agukọtaghi ha n'etiti umu Israel, n'ihi na enyeghi ha ihe-nketa n'etiti umu Israel.


N'ihi ya Livai esoghi umu-nne-ya nwe òkè ma-ọbu ihe-nketa; Jehova onwe-ya bu ihe-nketa-ya, dika Jehova, bú Chineke-gi, gwara ya okwu.)


Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n'elu ala-gi.


Nání ebo Livai ka ọ nēnyeghi ihe-nketa; àjà-ọku nile nke Jehova, bú Chineke Israel, nke ahu bu ihe-nketa-ya, dika Ọ gwara ya okwu.


Ma Moses enyeghi ebo Livai ihe-nketa: Jehova, bú Chineke Israel, bu ihe-nketa-ha, dika Ọ gwara ha okwu.


N'ihi na ndi Livai enweghi òkè n'etiti unu; n'ihi na ọlu-nchu-àjà Jehova bu ihe-nketa-ha: Gad na Reuben na nkera ebo Manase anarawo kwa ihe-nketa-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, nke Moses, bú orù Jehova nyere ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan