Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 17:11 - Bible Nso

11 dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 17:11
16 Iomraidhean Croise  

Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:


Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.


ka unu we zí kwa umu Israel ukpuru nile nke Jehova gwaworo ha site n'aka Moses.


i gēme kwa dika okwu ahu si di, nke ha gēgosi gi site n'ebe ahu nke Jehova gārọputa; i gēlezi kwa anya ime dika ihe nile si di nke ha gēzí gi:


ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.


Mb͕e ise-okwu di n'etiti ndikom, ha we biaru nso ka ewe kpe ikpe, ndi-ikpé we kpe ha; ha gāgu kwa onye ezi omume n'onye ezi omume, gu kwa onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu;


ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.


Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Nēchetara ha ka ha nēdo onwe-ha n'okpuru ndi-isi, n'okpuru ndi nwere ike, ka ha nēkwenye ekweye, ka ha buru ndi edoziworo ilu ezi ọlu nile ọ bula,


Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.


Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe;


ma nke kachasi ndi nējeso anu-aru n'agu ihe emeruru emeru, ndi nēlelì kwa ibu-onye-nwe-madu anya. Ndi nwere anya-ike, ndi nwere isi-ike, ha amaghi aru jijiji ikwulu ndi nọ n'ebube:


Ma otú ahu madu ndia nēmeru kwa anu-aru-ha n'irọ-nrọ-ha, ju kwa ibu-onye-nwe-madu, kwulu kwa ndi nọ n'ebube.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan