Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 16:21 - Bible Nso

21 Akurula onwe-gi Ashera nke osisi ọ bula n'akuku ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, nke i gēmere onwe-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Amanyela oyiyi osisi chi Ashera ọbụla gị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ị wuru nye Onyenwe anyị Chineke gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 16:21
10 Iomraidhean Croise  

Jehova gētib͕u kwa Israel, dika amì nēme nkpatu nime miri; Ọ gēropu kwa Israel n'ezi ala nka, nke O nyere ndi bu nna-ha, Ọ gēfesa kwa ha n'ofè Osimiri; n'ihi na ha emewo Asherim-ha, nākpasu Jehova iwe.


Ehab me-kwa-ra Ashera; Ehab we me ihe ọzọ ikpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe, kari ndi-eze nile nke Israel ndi buru ya uzọ.


Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè.


Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya mere ka ha la n'iyì, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Beal, me kwa Ashera, dika Ehab, bú eze Israel, mere, ọ kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.


Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke Ashera, bú nke o mere, n'ulo ahu nke Jehova siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, N'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:


Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.


kama unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, b͕utu Asherim-ha:


Unu emerela onwe-unu ihe-efu ọ bula, unu eguzoro-kwa-la onwe-unu arusi apiri api, ma-ọbu ogidi, unu etiye-kwa-la nkume emere ka o yie ihe n'ala-unu, ikpọ isi ala nye ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n'ọku.


Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova, chezọ Jehova, bú Chineke-ha, fè Bealim na Asherot.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan