Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 15:4 - Bible Nso

4 ma-ọbughi mb͕e ob͕eye nādighi n'etiti gi; (n'ihi na Jehova aghaghi igọzi gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi dika ihe-nketa ka i we nweta ya;)

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Otu ọ dị, o kwesighị ka ndị ogbenye dịrị nʼetiti gị, nʼihi nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị ka inweta dịka ihe nketa gị, ọ ga-agọzi gị nke ukwuu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 15:4
10 Iomraidhean Croise  

Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu.


Onye nēnye ob͕eye ihe, ihe adighi-akọ ya: Ma onye nēzobe anya-ya abua, agābu ya ọtutu ọnu.


onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.


nání ọ buru na i ge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, nke-ọma, ilezi anya ime ihe nile a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.


Jehova gēme kwa ka i babiga uba okè bayere ezi ihe, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.


M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.


Jehova wesa-kwa-ram iwe n'ihi okwu-unu, we ṅua iyi na m'gaghi-agabiga Jọdan, na m'gaghi-abà kwa n'ezi ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan