N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?
Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.
Otú ọ di, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi ka i gēb͕u, ri kwa anu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika ngọzi nke Jehova, bú Chineke-gi, nke O nyeworo gi, si di: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ya: dika mb͕ada, na dika ele.