Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 15:20 - Bible Nso

20 N'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n'ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Gị na ezinaụlọ gị ga-eri anụ ndị a nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị afọ ọbụla nʼebe ọ họpụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 15:20
6 Iomraidhean Croise  

Agēri kwa anu nke àjà-ekele nke àjà-udo-ya n'ubọchi nke onyinye-ya iji biaru nso; ọ gaghi-adọba ufọdu nime ya rue ututu.


ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:


kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu.


I pughi iri n'ọnu-uzọ-ama-gi nile otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, ma-ọbu umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi, ma-ọbu ihe ọ bula nke nkwa-gi nile nke i nēkwe, ma-ọbu onyinye-afọ-ofufo-gi nile, ma-ọbu àjà-nbuli nke aka-gi:


I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan