Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 15:13 - Bible Nso

13 Ma mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya, ezipula ya n'aka efu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe ọ hapụrụ ụlọ gị, ezipụkwala ya nʼaka efu!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 15:13
9 Iomraidhean Croise  

Ọ buru na Chineke nke nnam, bú Chineke nke Abraham, na Oké Egwù nke Aisak, anọghi n'akukum, n'ezie ub͕u a n'aka efu ka i gēzilagawomri. Nweda-n'alam na ndọb͕u m'ji akam abua nādọb͕u onwem n'ọlu ka Chineke huworo, Ọ̀ we bara gi nba n'abali nyahuru.


M'gēnye kwa ndi nka amara n'iru ndi Ijipt: o gēru kwa, mb͕e unu nāla, na unu agaghi-ab͕a aka la;


Ahuhu gādiri onye ji ajọ omume ewu ulo-ya, nke ji kwa ikpé nēzighi ezi ewu ime-elu-ya nile; nke nēme ka madu-ibe-ya fè òfùfè n'efu, ọ dighi-enye kwa ya ugwọ-ọlu-ya;


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Mb͕e agērenye gi nwa-nne-gi, bú nwoke Hibru, ma-ọbu nwayi Hibru, o we fè gi òfùfè arọ isi; n'arọ nke-asa i gēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya.


i gēsi n'ìgwè ewu na aturu-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-ọka-gi, si kwa n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine-gi, nyebiga ya okè; ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, ji gọzie gi ka i gēnye ya.


Ndi-nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù-unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwa-ra otù Onye Nke bu Onye-nwe-unu n'elu-igwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan