Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 15:10 - Bible Nso

10 I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ị ghaghị inye ha site nʼafọ ofufu, meekwa nke a na-enweghị obi ilu, mgbe ahụ, nʼihi nke a, Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-agọzi gị nʼọrụ gị niile nakwa ihe niile nke ị tinyere aka na ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 15:10
21 Iomraidhean Croise  

Onye nwere anya ọma, onye ahu ka agāgọzi; N'ihi na o werewo nri-ya ufọdu nye onye nēnweghi ike.


Zipu nri-gi n'elu miri: n'ihi na mb͕e ọtutu ubọchi gasiri i gāhu ya.


Ma onye amara aha-ya ezubewo ihe amara aha-ha; onye ahu nēguzosi kwa ike n'ime ihe amara aha-ha.


ọ buru kwa na i weputara onye agu nāgu ihe nkpuru-obi-gi chọrọ, ọ buru na i me ka afọ ju nkpuru-obi ewedara n'ala; ìhè-gi gāwa nime ọchichiri, oké ọchichiri-gi gādi kwa ka etiti-ehihie:


Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye.


N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.


ma-ọbu onye nākasi obi, ya nọ na nkasi-obi-ya: onye nēme ka ndi ọzọ keta ihe o nwere, ya were afọ-ofufo me ya; onye bu onye-isi, ya were obi nānu ọku nābu isi; onye nēme ebere, ya were obi-utọ me ya.


Anu-ufe ọ bula nke nēnuputa enuputa, ihe-árú ka ọ buru unu; agaghi-eri ha.


onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.


Ọ gaghi-adi ike n'anya-gi, mb͕e i nēzipu ya n'ebe i nọ ka o nwere onwe-ya; n'ihi na okpukpu ugwọ-ọlu nke onye egoro ọlu ka o fèworo gi òfùfè arọ isi: Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi kwa gi n'ihe nile nke i nēme.


ma-ọbughi mb͕e ob͕eye nādighi n'etiti gi; (n'ihi na Jehova aghaghi igọzi gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi dika ihe-nketa ka i we nweta ya;)


onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.


Mb͕e i nēwe ihe-ubi n'ubi-gi, i we chezọ ùkwù ọka n'ubi, ejeghachila iweta ya: ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ka ọ gādiri: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume aka-gi nile.


Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n'ebe i nọ n'ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ.


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan