Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 14:7 - Bible Nso

7 Otú ọ di, ndia ka unu nāgaghi-eri n'etiti ihe nātaghari ọnu, ma-ọbu n'etiti ndi ukwu-ha wara njakpa: camel, na hare, na coney, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ha bu, ma ha abughi ihe ukwu wara njakpa, ihe ruru árú ka ha buru unu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 14:7
10 Iomraidhean Croise  

Anu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.


Coney kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.


Hare kwa, n'ihi na ihe nātaghari ọnu ka ọ bu, ma ukwu-ya awaghi njakpa, ihe ruru árú ka ọ buru unu.


Ma onye ọ bula nke nānu okwum ndia, ma ọ dighi-eme ha, agēji ya tuyere nwoke nke bu onye-nzuzu, onye wuru ulo-ya n'elu ájá:


Anumanu ọ bula nke ukwu-ya wara njakpa, nke ukwu-ya wara-kwa-ra awara abua, nke nātaghari kwa ọnu, n'etiti anumanu, nke ahu ka unu gēri.


ezì kwa, n'ihi na ihe ukwu-ya wara njakpa ka ọ bu, ma ọ bughi ihe nātaghari ọnu, ihe ruru árú ka ọ buru unu: unu erila ihe sitere n'anu-ha, unu emetu-kwa-la ozu-ha aka.


ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.


Ha nēkwuputa na ha matara Chineke; ma ọlu nile ha ka ha ji gọnari Ya, ebe ha bu ihe-ùrú, ndi nādighi-ekwenye kwa, buru kwa ndi ajuru aju n'ebe ezi ọlu nile ọ bula di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan