Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 13:17 - Bible Nso

17 Ọ dighi kwa ihe ọ bula site n'ihe ahu ewezugara ka ebibie ya gārapara n'aka-gi: ka Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia, gosi gi obi-ebere, nwe obi-ebere n'aru gi, me ka i ba uba, dika Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ọ dịghị ihe ndị ahụ e debere nye mbibi nke e kwesiri ịhụ nʼaka gị. Nke a ga-emekwa ka iwe ọkụ Onyenwe anyị dajụọ, ka o gosikwa gị obi ebere. Ọ ga-enwekwa ọmịiko nʼahụ gị, meekwa ka ị baa ụba nʼọnụọgụgụ, dịka o ji ịṅụ iyi kwee nna nna gị ha na nkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 13:17
26 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.


M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


nkpuru-gi gādi kwa ka ájá ala, i gāb͕asa n'uzọ Ọdida anyanwu na n'uzọ Iru-anyanwu na n'uzọ Ugwu na n'uzọ Ndida: agāgọzi kwa ab͕uru nile nke elu-uwa nime gi na nime nkpuru-gi.


Ma Ya onwe-ya, ebe O nwere obi-ebere, Ọ nēkpuchi ajọ omume-ha, Ọ dighi-ebibi kwa ha: E, ọtutu mb͕e ka O mere iwe-Ya ka ọ laghachi azu, Ọ dighi-akpọte kwa ọnuma-Ya nile.


I kpochapuwo nrubiga-ókè nke iwe-Gi: I siwo n'di-ọku nke iwe-Gi chighari Onwe-gi.


ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.


N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.


N'ihi na ọ buru na O mekpa aru, ma Ọ gēnwe obi-ebere dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di.


Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo: ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka ọ gābu n'ebe ha nọ: M'gēdo kwa ha, me ka ha ba uba, M'gētiye kwa ebe nsọm n'etiti ha rue mb͕e ebighi-ebi.


M'gaghi-emezu idi-ọku nke iwem, M'gaghi-alaghachi ibibi Efraim: n'ihi na Chineke ka M'bu, abughm madu; n'etiti gi ka Mu, bú Onye nsọ, nọ: M'gaghi-abata kwa n'obodo.


Jehova we si Moses, Chiri ndi-isi nile nke ndim, kpọgidere ha Jehova n'iru anyanwu, ka idi-ọku nke iwe Jehova we si n'aru Israel laghachi.


Ọ buru na onye ọ bula adighi-ahu Onye-nwe-ayi n'anya, ka ọ buru anathema. Onye-nwe-ayi nābia.


mb͕e i gēge kwa olu Jehova, bú Chineke-gi, nti, idebe ihe nile Ọ nyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka i we me ihe ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.


na Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka ndi-gi adọtara n'agha lata, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru gi, laghachi, chikọputa gi nime ndi ahu nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, meworo ka i b͕asa.


Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i ba n'ala ahu nke nna-gi-hà nwetara, i gēnweta kwa ya; Ọ gēme kwa gi nma, me kwa ka i ba uba kari nna-gi-hà.


Ọ gāhu kwa gi n'anya, gọzie gi, me ka i ba uba: Ọ gāgọzi kwa nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-gi, bú ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi, n'elu ala ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi.


eme-kwa-la ka ihe-árú ba n'ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n'ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.


Ekan nwa Zera, ọ̀ mekpughi ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova, ma n'aru nzukọ nile nke Israel ka iwe dikwasi? ma ọ bughi nání ya onwe-ya, bú otù onye, kubirì ume n'ajọ omume-ya.


Ma otú ọ di, unu onwe-unu debenu onwe-unu ka unu ghara imetu ihe ewezugara nye Jehova aka, ka unu we ghara iwere ihe ahu ewezugara, mb͕e unu wezugasiri ya; unu ewe me ka ọmuma-ulo-ikwū Israel buru ihe ewezugara ka ebibie ya, unu ewe mekpa ya aru.


Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova.


Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.


Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.


Ha we guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta; Jehova we si n'idi-ọku nke iwe-Ya chigharia. N'ihi ya akpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Ekoa, rue ta.


Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan