Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 13:16 - Bible Nso

16 I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ihe nkwata niile i si nʼobodo ahụ kwata ka ị ga-ekpokọta nʼotu ebe, nʼama dị nʼetiti obodo ahụ. A ga-akpọkwa ha niile ọkụ, gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ, dịka aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Ruo mgbe ebighị ebi, obodo ahụ ga-abụ mkpọmkpọ ebe, a gaghị ewugharịkwa ya ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 13:16
13 Iomraidhean Croise  

Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua.


Ibu eboro Damaskọs. Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.


N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


M'gēme kwa Sameria ka ọ ghọ obo-ihe nke ọhia, ka ọ ghọ kwa ebe akuru ubi-vine: M'gāwusi kwa nkume-ya nile nime ndagwurugwu, ọ bu kwa ntọ-ala-ya nile ka M'gēkpughe.


Unu gēsure arusi nile apiri api nke chi nile ha n'ọku: enwela anya-uku n'ọla-ọcha na ọla-edo nke di n'aru ha, ewe-kwa-la n'onwe-gi, ka aghara ima gi n'ọnyà nime ya: n'ihi na ihe-árú nke Jehova, bú Chineke-gi, ka ọ bu:


eme-kwa-la ka ihe-árú ba n'ulo-gi, i we ghọ ihe ewezugara ka ebibie ya dika ya: i gājusi ya aju, kpọ kwa ya ihe rusiri árú; n'ihi na ihe ewezugara ka ebibie ya ka ọ bu.


Ha we were ọnu mma-agha wezuga ihe nile di n'obodo ahu ka ebibie ya, ma nwoke ma nwayi, ma nwata ma okenye, na ehi, na aturu, na inyinya-ibu.


Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova.


Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.


Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan