Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 13:13 - Bible Nso

13 Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 na ụfọdụ ndị mmadụ jọgburu onwe ha eduhiela ndị obodo ha, na-asị, “Ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị na mbụ),

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 13:13
24 Iomraidhean Croise  

Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya:


Ma ọ dabatara otù nwoke jọb͕uru onwe-ya inọ n'ebe ahu, aha-ya bu Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin: o we fùa opì-ike, si, Ayi enweghi òkè nime Devid, ayi enweghi kwa ihe-nketa nime nwa Jesi: nwoke ọ bula, ya la n'ulo-ikwū-ya, Israel.


Ma ndi jọb͕uru onwe-ha di ka ogwu anēkopu ekopu, ha nile, N'ihi na ọ bughi aka ka eji ewere ha:


me-kwa-nu ka ndikom abua, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, nọdu n'iru ya, ka ha b͕a kwa àmà megide ya, si, I b͕akutere Chineke na eze azu. Me-kwa-nu ka ọ pua, werenu nkume tub͕ue ya, ka ọ nwua.


Ndikom abua ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we bata, nọdu n'iru ya: ndikom ahu ndi jọb͕uru onwe-ha we b͕a àmà megide ya, bú Nebot, n'iru ndi Israel, si, Nebot b͕akutere Chineke na eze azu. Ha we me ka ọ pua rue azu obodo, ha were nkume tub͕ue ya, o we nwua.


N'ihi na Ọ dọwapuru Israel n'ulo Devid; ha we me Jeroboam nwa Nebat eze: Jeroboam we chuputa Israel n'iso Jehova, o we me ka ha mehie nmehie uku.


Ndikom efu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ, b͕a onwe-ha ume imegide Rehoboam nwa Solomon, ma Rehoboam bu nwata di kwa nrò n'obi, o meghi kwa onwe-ya ka ọ di ike n'iru ha.


Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahu bu ob͕u-madu site na mbu, o guzoghi kwa n'ezi-okwu, n'ihi na ezi-okwu adighi nime ya. Mb͕e ọ bula ọ nēkwu okwu-ugha, ọ nēkwu ihe si n'ihe nke aka ya puta: n'ihi na ọ bu onye-ugha, buru kwa nna-ya.


Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita?


Mb͕e i gānu okwu n'otù nime obodo-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ibi n'ebe ahu, si,


i gāju kwa ase, gwu ala-ya, juta nke-ọma; ma, le, asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'etiti gi;


ihe-iriba-ama ahu ma-ọbu ihe-ebube ahu we me, nke ọ gwara gi okwu bayere ya, si, Ka ayi jeso chi ọzọ n'azu, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha), ka ayi fè kwa ha òfùfè;


Mb͕e nwa-nne-gi nwoke, bú nwa nke nne-gi, ma-ọbu nwa-gi nwoke, ma-ọbu nwa-gi nwayi, ma-ọbu nwunye nke obi-gi, ma-ọbu eyì-gi, nke di ka nkpuru-obi-gi, gārafu gi na nzuzo, si, Ka ayi je fè chi ọzọ, (nke ọ nādighi mb͕e i mara ha, gi onwe-gi, ma-ọbu nna-gi-hà;


ewe gosi gi ya, i we nu ya, i gāju kwa ase nke-ọma, ma, le asi na ọ bu ezi-okwu, okwu ahu eguzosi ike, na emewo ihe-árú ahu n'Israel;


ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile.


Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.


Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu: onye ọ bula nke nādighi-eme ezi omume esighi na Chineke puta, onye nke nādighi-ahu nwa-nna-ya n'anya esighi kwa na Ya puta.


Ndia bu ndi nākpata nkewa, ndi nkpuru-obi madu nāchi, ndi nēnweghi Mọ Nsọ.


Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.


Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel.


Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Ma ub͕u a mara hu kwa ihe i gēme; n'ihi na ezubesiri ihe ọjọ ike megide onye-nwe-ayi, megide kwa ulo-ya nile: ma ya onwe-ya bu nwoke jọb͕uru onwe-ya, nke madu nāpughi igwa ya okwu.


Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan