Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 12:28 - Bible Nso

28 Riba okwu ndia nile ama, nu kwa ha, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu, ka ọ we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi rue mb͕e ebighi-ebi, mb͕e i nēme ihe di nma nke ziri ezi n'anya Jehova, bú Chineke-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 12:28
15 Iomraidhean Croise  

ndikom Ava me-kwa-ra Nibaz na Tatak, ma ndi Sefavaim nēsurere Adramelek na Anamelek umu-ha n'ọku, bú chi abua nke Sefavaim.


Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, ọbuná ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;


si, Biko, Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, Chineke uku, Nke di kwa egwu, Onye nēdebere ndi nāhu Ya n'anya nēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu, ọb͕ub͕a-ndu-Ya na ebere:


Ka ha we debe ukpuru-Ya nile, Riba kwa iwu-Ya nile ama. Tonu Ja.


Debere onwe-gi ihe nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta: le, M'gaje ichupu ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, n'iru gi.


Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya:


Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n'ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha.


Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile, me kwa ha: Mu onwem bu Jehova.


Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.


Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.


Ub͕u a unu onwe-unu di ọcha n'ihi okwu nke M'gwaworo unu.


Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.


Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.


I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.


N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan