Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 12:27 - Bible Nso

27 i gāchu kwa aja-nsure-ọku-gi nile, anu na ọbara, n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi: agāwukwasi kwa ọbara nke àjà-gi nile n'ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi, ma i gēri anu-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 12:27
7 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Tukwasinu àjà-nsure-ọku nile unu n'elu àjà nile unu, ri-kwa-nu anu.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēweta anu ahu nile nso, sure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà; àjà-nsure-ọku ka ọ bu, àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


Ọ gēb͕u kwa nwa-ehi ahu n'iru Jehova: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gēweta ọbara-ya nso, wusa ọbara ahu n'ebe-ichu-àjà buruburu, bú nke di n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


ma ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya ka ọ gāsa miri: onye-nchu-àjà gēsuresi kwa anu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, bú àjà-ọku nke ihe ísì utọ anāchuru Jehova.


N'ihi na ndu nke anu-aru, n'ọbara ka ọ di: Mu onwem enyewo kwa unu ya n'elu ebe-ichu-àjà ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie-ha n'ihi na ọbara ka ọ bu nke nēkpuchi nmehie nime nkpuru-obi.


Ma ọ buru na onyinye-ya iji biaru nso bu ihe àjà nke àjà-udo; ọ buru na ọ bu ihe si n'ìgwè ehi puta ka ya onwe-ya nēweta nso, ma ọ bu oké ma-ọbu nwunye, n'izu-okè ka ọ gēweta ya nso n'iru Jehova.


Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan