24 Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.
24 Erila ọbara, wụsa ya nʼala dịka mmiri.
Ọ gābu ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ-unu nile n'ebe-obibi-unu nile, na unu agaghi-eri abuba ọ bula ma-ọbu ọbara ọ bula.
Nání na unu agaghi-eri ọbara; i gāwusi ya n'ala dika miri.
Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.
Erila ya; ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.
Nání na i gaghi-eri ọbara-ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.