Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 12:23 - Bible Nso

23 Nání, di ike ka i ghara iri ọbara: n'ihi na ọbara bu ndu; eri-kwa-la ndu tiyere anu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ma lezie anya hụ na i righị ọbara, nʼihi na ndụ dị nʼọbara. Ị gaghị erikọta anụ ọbụla na ndụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 12:23
17 Iomraidhean Croise  

Nání anu-aru nke ndu-ya, bú ọbara-ya, di nime ya ka unu nāgaghi-eri.


N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Anu na ọbara-ya ka unu nēri, unu nēweli kwa anya-unu le arusi nile unu, ọbara ka unu nāwusi kwa: ọ̀ kwa ala nka ka unu gēnweta?


Ọzọ, nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēri ọbara ọ bula; M'gēche kwa irum megide madu ahu nke nēri ọbara, M'gēbipu kwa ya n'etiti ndi-ya.


N'ihi na ndu nke anu-aru, n'ọbara ka ọ di: Mu onwem enyewo kwa unu ya n'elu ebe-ichu-àjà ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie-ha n'ihi na ọbara ka ọ bu nke nēkpuchi nmehie nime nkpuru-obi.


Unu erila ihe ọ bula ya na ọbara-ya: unu ab͕ala afa, unu eji-kwa-la igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ.


Ọ dighi kwa ọbara ọ bula unu gēri n'ebe-ọbibi-unu nile, nke anu-ufe, ma ọbu nke anumanu.


dika Nwa nke madu abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.


kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara.


Nání na unu agaghi-eri ọbara; i gāwusi ya n'ala dika miri.


Nání, dika anēri mb͕ada na ele, otú a ka i gēri ha: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ha n'otù uzọ ahu.


Erila ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.


Nání na i gaghi-eri ọbara-ya; i gāwusi ya n'ala dika miri.


Ha nābù kwa abù ọhu, si, I kwesiri inata akwukwọ ahu, na isaghe akàrà-ya: n'ihi na eb͕uru Gi eb͕u, I were kwa ọbara-Gi b͕atara Chineke madu si n'ebo nile ọ bula, na asusu nile ọ bula, na ndi nile ọ bula, na mba nile ọ bula, puta,


Ndi Israel we dakwasi ihe akwatara n'agha, ha we chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na umu-ehi, b͕ue ha n'ala ahu: ndi Israel we rie ha na ọbara.


Ha we gosi Sọl, si, Le, ndi Israel nēmehie megide Jehova n'iri anu, ya na ọbara. O we si, Unu aghọwo aghughọ: kpọrekutem nkume uku ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan