Diuteronomi 12:21 - Bible Nso21 Mb͕e ọ gādikari gi anya, bú ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa itiye aha-Ya n'ebe ahu, i gēb͕u kwa ufọdu nime ìgwè ehi-gi na nime ìgwè ewu na aturu-gi, nke Jehova nyeworo gi, dika m'nyeworo gi iwu, i gēri kwa n'ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a21 Ọ bụrụ nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke gị kpọkwasịrị aha ya dị gị anya site nʼebe i nọ, i nwere ike gbuo anụ ụlọ site nʼigwe ehi maọbụ ewu na atụrụ nke Onyenwe anyị nyere gị, dịka m si nye gị nʼiwu. Gbuo ha nʼobodo ebe i bi, riekwa ha otu ị chọrọ. Faic an caibideil |
ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:
i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.