Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 12:2 - Bible Nso

2 Unu aghaghi ime ka ebe ahu nile la n'iyì, bú ebe mba nile unu nēnweta fère chi nile ha òfùfè, n'elu ugwu nile ha di elu, na n'elu ugwu ntà nile ha, na n'okpuru osisi ndu ọ bula:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Tikpọọnụ ebe niile nke dị nʼelu ugwu niile dị elu na nʼelu ugwu niile dị nta, nakwa nʼokpuru osisi mgbasa ọbụla, bụ ebe mba niile unu na-anapụ ala ha fere chi niile ha ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 12:2
22 Iomraidhean Croise  

Ha onwe-ha we wu-kwa-ra onwe-ha ebe di elu, na ogidi, na Asherim, n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula;


Nání na ndi Israel nāchu àjà n'ebe nile di elu, n'ihi na ọ dighi ulo ewuru aha Jehova rue mb͕e ahu.


Ndi nile nke ala ahu we ba n'ulo Beal, kwatue ya; ebe-ichu-àjà-ya nile na onyinyo-ya nile, ha tupiara ha nke-ọma, ha b͕u-kwa-ra Matan, bú onye-nchu-àjà Beal, n'iru ebe-ichu-àjà ahu. Onye-nchu-àjà we do ndi-nkekọta ilekọta ulo Jehova.


Ọ chua àjà, sure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe nile di elu, na n'elu ugwu ntà nile, na n'okpuru osisi ndu ọ bula.


Ebe nile di elu nke di n'iru Jerusalem, nke di n'aka-nri ugwu nbibi, nke Solomon, bú eze Israel, wuru nye Ashtoret, bú ihe-árú ndi Zaidon, nye kwa Kemosh, bú ihe-árú Moab, nye kwa Milkom, bú ihe-árú umu Amon, eze meru-kwa-ra ha.


Ha we were ebe nile ha di elu kpasue Ya iwe, Were kwa arusi nile ha apiri api me ka O kwo ekworo.


Akpọla isi ala nye chi nile ha, efè-kwa-la ha, eme-kwa-la dika omume nile ha si di: kama i gākwadasi ha, tipiasi kwa ogidi nile ha.


Ma ọ buru na i sim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu Onye Hezekaia wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala?


ebe umu-ha nēcheta ebe-ichu-aja nile ha na Asherim-ha n'akuku osisi ndu n'elu ugwu ntà ha nile di elu.


N'ihi na site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka M'b͕ajiworo yoke-gi, tijie ab͕u-gi nile; i we si, M'gaghi-efè òfùfè; n'ihi na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu nan'okpuru osisi ndu ọ bula ka gi onwe-gi nērulata onwe-gi, nākwa iko.


Nání mara ajọ omume-gi, na ọ bu Jehova, bú Chineke-gi, ka i jehieworo megide, i we wasara ndi ala ọzọ uzọ-gi nile n'okpuru osisi ndu ọ bula, ma olum ka unu nēgeghi nti, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Welie anya-gi abua le ebe nile di elu nke ọhia nādighi, hu; òle ebe gi na ndikom nēdinakọtaghi? N'uzọ nile ka i nọworo nēle anya ha, dika onye Arebia n'ọzara; i we were ikwa-iko-gi nile, were kwa ihe ọjọ gi, merua ala.


Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.


N'elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n'elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n'ihi na ǹdò-ya di nma: n'ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n'ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko.


O rue, n'ututu, na Belak kuru Belam, me ka ọ rigo na Bamot-beal, ọ we si n'ebe ahu hu nsọtu ndi Israel.


Kama otú a ka unu gēme ha; unu gākwatu ebe-ichu-àjà nile ha, tupia kwa ogidi nile ha, b͕utu kwa Asherim-ha, sure kwa arusi nile ha apiri api n'ọku.


ma unu onwe-unu na ndi bi n'ala nka ab͕ala ndu; unu gākwatu ebe-ichu-aja nile ha: ma unu egeghi nti olum: gini bu nka unu meworo?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan