Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 12:18 - Bible Nso

18 kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Kama unu ga-eri ha nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, gị onwe gị, na ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwanyị, na ndị odibo nwoke na nwanyị niile unu, na ndị Livayị si nʼobodo unu niile, unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, nʼihe niile aka gị rụpụtara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 12:18
19 Iomraidhean Croise  

Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume: Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n'obi.


Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke: E, ka ha wulie elu n'ọṅù.


Uzọ-ya nile bu uzọ nke idi-utọ, Okporo-uzọ-ya nile bu kwa udo.


Amawom na ọ dighi ezi ihe diri ha, ma-ọbughi ka madu ṅuria ọṅu, me kwa ezi ihe n'ogologo ndu-ya.


Le, ihe nke mu onwem huworo na ọ bu ezi ihe nke mara nma bu ka madu rie ihe, ka ọ ṅu kwa ihe-ọṅuṅu, ka ọ hu kwa ezi ihe nime ndọb͕u-ya nile nke ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu nime ya n'okpuru anyanwu, ọnu-ọgugu ubọchi ndu-ya nke Chineke nyeworo ya: n'ihi na nka bu òkè-ya.


Unu gēji kwa obi-utọ seputa miri n'isi-iyi nile nke nzọputa.


O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke.


Ha ji kwa otù obi nānọgidesi ike n'ulo uku Chineke kwa-ubọchi, ha nānyawa kwa achicha n'ulo-ha, we nara ihe-oriri-ha n'obi utọ na obi nke aghughọ nādighi ya,


Ya mere ma unu nēri ihe, ma unu nāṅu ihe, ma unu nēme ihe ọ bula, nēmenu ihe nile ka ewe nye Chineke otuto.


Ma nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n'anya, ọṅù, udo, ogologo-ntachi-obi; obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi,


kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu.


Lezie onwe-gi anya ka i ghara irapu onye Livai ubọchi-gi nile n'elu ala-gi.


Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:


unu gēri kwa ihe n'ebe ahu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, unu gāṅuri kwa ọṅu n'ihe nile unu nēseti aka-unu ime, unu onwe-unu na ulo-unu, nke Jehova, bú Chineke-gi, gọziworo gi nime ha.


I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.


N'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n'ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi.


Ubọchi ahu wee rue, Elkena we chua àjà, nye Penina nwunye-ya òkè ufọdu, nye kwa umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan