Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 12:14 - Bible Nso

14 kama n'ebe nke Jehova gārọputa n'otù nime ebo-gi, n'ebe ahu ka i gēsure àjà-nsure-ọku-gi nile, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēme ihe nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 ọ bụ naanị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ ga-ahọpụta otu ebe, nʼala otu ebo. Ọ bụ naanị nʼebe ahụ ka ị ga-esure aja unu niile, ọ bụkwa nʼebe ahụ ka ị ga-eweta onyinye gị niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 12:14
24 Iomraidhean Croise  

ọ buru na ndi nka arigo ichu àjà n'ulo Jehova na Jerusalem, obi ndi nka gālaghachikuru kwa onye-nwe-ha, bú Rehoboam eze Juda; ha gēb͕ukwam, laghachikuru Rehoboam, bú eze Juda.


ka anya-Gi abua we nāsaghe n'ebe ulo a di abali na ehihie, bú n'ebe ebe ahu di nke I siworo, Aham gādi n'ebe ahu: ige nti ekpere nke orù-Gi gēkpe n'ebe a di.


Ma ọ buru na unu asim, Ọ bu Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi tukwasiworo obi: ọ̀ bughi Onye ahu bu onye Hezekaia wezugara ebe nile Ya di elu na ebe-ichu-àjà-ya nile, si Juda, si kwa Jerusalem, N'iru ebe-ichu-àjà nka ka unu gākpọ isi ala nime Jerusalem?


Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.


Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi: M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi.


Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion: Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.


Nwoke ọ bula nke ulo Israel, nke nēb͕u ehi, ma-ọbu nwa-aturu, ma-ọbu ewu, n'omuma-ulo-ikwū, ma ọbu nke nēb͕u ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū,


ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, iweta ya nso ka ọ buru onyinye iji biaru nso Jehova n'iru ebe-obibi Jehova: ọbara ka agāguru nwoke ahu; ọbara ka ọ wusiworo; agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti ndi-ya:


nke bu na Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n'otù, nāgughi ndahie nile ha megide ha, O debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n'otù ahu.


ọ gēru kwa, na ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, n'ebe ahu ka unu gēwebata ihe nile m'nēnye unu n'iwu; àjà-nsure-ọku nile unu, na àjà nile unu, na otù uzọ n'uzọ iri nke ihe-unu nile, na àjà-nbuli nke aka-unu, na ihe-nkwa-unu nile arọputara arọputa nke unu nēkwe Jehova:


Lezie onwe-gi anya ka i ghara isure àjà-nsure-ọku-gi n'ebe ọ bula i gāhu:


Otú ọ di, n'agu nile nke nkpuru-obi-gi ka i gēb͕u, ri kwa anu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika ngọzi nke Jehova, bú Chineke-gi, nke O nyeworo gi, si di: onye ruru árú na onye di ọcha gēri ya: dika mb͕ada, na dika ele.


kama ọ bu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ha, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula: i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, na nseti aka-gi ọ bula.


Kama rue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, gārọputa n'ebo-unu nile, itiye aha-Ya n'ebe ahu, rue ebe-obibi-Ya ka unu gāchọ, i gābà kwa n'ebe ahu:


I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.


N'iru Jehova, bú Chineke-gi, ka i gēri ya kwa-arọ n'ebe ahu nke Jehova gārọputa, gi onwe-gi na ulo-gi.


I gāchu-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, àjà ngabiga, nke ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'ebe ahu nke Jehova gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.


Mb͕e okwu ọ bula gākari gi n'ikpé, n'etiti ọbara na ọbara, ma-ọbu n'etiti okwu-ikpé na okwu-ikpé, ma-ọbu n'etiti otiti-ihe na otiti-ihe, bú okwu nile nke ise-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile: i gēbili kwa, rigorue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa;


Mb͕e onye Livai gābia site n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile site n'Israel nile, ebe ya onwe-ya nọ dika ọbìa, ọ we were agu nile nāgu nkpuru-obi-ya biarue ebe ahu nke Jehova gārọputa;


mb͕e Israel nile gābia ka ahu ha anya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa, i gāgu iwu a n'iru Israel nile na nti-ha.


Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.


Ya buru ayi ihe-árú inupu isi n'okpuru Jehova, na isi n'iso Jehova chigharia ta, iwu ebe-ichu-àjà isure àjà-nsure-ọku, ma-ọbu inye onyinye-inata-iru-ọma, ma-ọbu ichu àjà, nāgughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, di n'íru ebe-obibi-Ya.


Joshua we me ha n'ubọchi ahu ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri bayere nzukọ Israel, baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà Jehova, rue ta, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan