Diuteronomi 12:10 - Bible Nso10 Ma mb͕e unu gabigara Jọdan, biri n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēme ka unu keta, mb͕e O mesi-kwa-ra ka unu zuru ike pua n'aka ndi-iro-unu buruburu, unu we biri na ntukwasi-obi; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Kama, mgbe unu gafere osimiri Jọdan, birikwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu dịka ihe nketa, mgbe Onyenwe anyị nyere unu izuike, meekwa ka unu nwere onwe unu site nʼebe ndị iro unu nọ. Faic an caibideil |
agānu kwa ọzọ olu nke obi-utọ na olu ọṅù, na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu, na olu nke ndi nāsi, Kelenu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'ihi na Jehova di nma, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di: na olu nke ndi nēwebata ekele n'ulo Jehova. N'ihi na M'gēme ka ndi ala nka adọtara n'agha lata dika na mbu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.