Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 11:25 - Bible Nso

25 Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru unu: ujọ-unu na egwu-unu ka Jehova, bú Chineke-unu, gātukwasi n'iru ala ahu nile nke unu gāzọkwasi, dika Ọ gwaworo unu okwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ imegide unu nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-emenye ha egwu na ụjọ nʼafọ nʼụzọ ọbụla unu na-aga, dịka o kwere na nkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 11:25
7 Iomraidhean Croise  

Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.


Oké ujọm ka M'gēziga n'iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M'gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile.


Ta ka M'gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n'iru ndi nile n'okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n'ihi unu.


Ọ gēnye kwa ndi-eze-ha n'aka-gi, i gēme kwa ka aha-ha lapu n'iyì n'okpuru elu-igwe: ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi, rue mb͕e i gēkpochapu ha.


Ọ dighi nwoke ọ bula gēguzo onwe-ya n'iru gi ubọchi nile nke ndu-gi: dika M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi: M'gaghi-ara gi aka, M'gaghi-arapu kwa gi.


ọ si ndikom ahu, Amawom na Jehova enyewo unu ala nka, amawokwam na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, amawokwam na ndi nile nēbi n'ala nka ab͕azewo n'iru unu.


O rue, mb͕e eze nile nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan n'akuku ọdida-anyanwu, na eze nile nke ndi Kenean, ndi bi n'akuku oké osimiri, nuru na Jehova mereri ka miri Jọdan takọrọ n'iru umu Israel, rue mb͕e ayi gabigasiri, na obi lọrọ ha miri, mọ adighi kwa nime ha ọzọ, n'ihi umu Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan