Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 10:5 - Bible Nso

5 M'we chigharia si n'ugwu ahu rida, tiye mbadamba nkume ahu nime ib͕e ahu nke m'mereri; ha di kwa n'ebe ahu, dika Jehova nyerem iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe m si nʼugwu ahụ rịdata, etinyere m mbadamba nkume abụọ ahụ nʼime igbe ahụ m kwara, dịka Onyenwe anyị nyere m nʼiwu. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 10:5
10 Iomraidhean Croise  

I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi.


I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi.


Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu.


Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.


O rue, mb͕e Moses siri n'ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka Moses mb͕e o siri n'ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka.


O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:


M'gēdekwasi kwa na mbadamba nkume ahu okwu nile nke di n'elu mbadamba nkume mbu, nke i tupiara, i gētiye kwa ha nime ib͕e ahu.


M'we chigharia, si n'ugwu ahu rida, ugwu ahu nēre kwa ọku: mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu di kwa n'elu akam abua.


Joshua we guzo nkume iri na abua n'etiti Jọdan, bú ebe-nguzo siri ike nke ukwu ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu: ha we di n'ebe ahu, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan