Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n'ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe unu nọ chigharia.
Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.
ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n'obi anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, inọ n'ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu.
Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;
Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n'obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, ka i we di ndu.
N'ihi na mu onwem amawo nnupu-isi-gi, na nkwesi-olu-ike-gi: le, mb͕e m'nānọ ndu n'etiti unu ta, unu aburuwo ndi nānupu isi n'okpuru Jehova; ùnu gēsi aṅa ghara inupu isi kari nke-uku mb͕e ọnwum gasiri?