Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 10:10 - Bible Nso

10 Mu onwem guzo-kwa-ra n'ugwu ahu, dika na mb͕e mbu, ọgu ubọchi abua, ehihie na abali: Jehova we gekwam nti na mb͕e ahu; Jehova achọghi ibibi gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ugbu a, anọọla m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, dịka m mere nʼoge mbụ, Onyenwe anyị gekwara m ntị nʼoge ugbu a. Ọ bụghị ọchịchọ Onyenwe anyị ibibi unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 10:10
10 Iomraidhean Croise  

Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya.


Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.


Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.


Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya. Ọ bu Eze Israel; ka O si n'elu obe ridata ub͕u a, ayi gēkwe kwa na Ya.


Jehova we sim, Bilie, je ka i bulie ije n'iru ndi nkem; ha gābà kwa, nweta ala ahu, nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi inye ha.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova ọgu ubọchi abua ahu, ehihie na abali, nke m'tururu onwem n'ala; n'ihi na Jehova siri na Ọ gēkpochapu unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan