Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 1:36 - Bible Nso

36 ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, ya onwe-ya gāhu ya; ọ bu ya ka M'gēnye ala ahu nke ọ zọkwasiri ukwu, M'gēnye kwa umu-ya: n'ihi na o sozuwo Jehova n'azu

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 karịakwa Kaleb, nwa Jefune. Ọ ga-ahụ ala ahụ anya, aga m enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ọ zọkwasịrị ụkwụ ya, nʼihi na o ji obi ya niile sogide Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 1:36
10 Iomraidhean Croise  

Nkpuru-obim nārapara Gi n'aru n'iso Gi n'azu: Mu ka aka-nri-gi jideworo.


Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma.


Nke diri ebo Juda bu Keleb nwa Jefune.


ma orùm Keleb, n'ihi na mọ di iche nọ n'ime ya, n'ihi kwa na o nēsozum n'azu, M'gēme kwa ka ọ ba n'ala ahu ebe ọ bara; nkpuru-ya gēnweta kwa ya.


N'ihi na Jehova kwuru okwu bayere ha, si, Ha aghaghi inwu n'ọzara nka. Ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nime ha, ma-ọbughi nání Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.


ma ọ bu nání Keleb nwa Jefune, bú onye Kenizait, na Joshua nwa Nun: n'ihi na ha esozuwo Jehova n'azu.


Ndia bu aha ndikom ahu: nke ebo Juda, Keleb nwa Jefune.


N'ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n'Ijipt puta site n'aka Moses?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan