Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 1:21 - Bible Nso

21 Le, Jehova, bú Chineke-gi, edowo ala ahu n'iru gi: rigo, nweta, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu; atula egwu, atu-kwa-la ujọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Lee, Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala ahụ. Gaanụ nweta ya ka ọ bụrụ nke unu dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu gwara unu sị, Unu atụla egwu, ka obi unu gharakwa ịda mba.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 1:21
20 Iomraidhean Croise  

ọ bu kwa nri nke sitere n'elu-igwe ka I nyere ha bayere agu-ha, me kwa ka miri si na nkume di elu putara ha bayere akpiri-ikpọ-nku-ha, I si-kwa-ra ha ba nime inweta ala ahu nke I weliri aka-Gi inye ha.


Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


Keleb we me ka ndi Israel b͕a nkiti n'ebe Moses nọ, ọ si, Ka ayi rigo nọ, nweta ya; n'ihi na ayi puru ime ya nke-ọma.


Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya.


M'we si unu, Unu abiaruwo ugwu ndi-Amorait, nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.


Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha;


Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.


atula egwu ha: i gēcheta nke-ọma ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, mere Fero, me kwa Ijipt nile;


Amala jijiji n'iru ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu Chineke uku, di kwa egwu.


Mb͕e Jehova siri na Kedesh-banea ziga unu, si, Rigonu, nweta ala ahu nke M'nyeworo unu; unu we nupu isi n'okwu-ọnu Jehova, bú Chineke-unu, unu ekweghi kwa Ya, unu egeghi kwa nti n'olu-Ya.


Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem?


Idi ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēme ka ndi nka keta ala ahu nke M'ṅuru nna-ha iyi inye ha.


Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan