Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 1:11 - Bible Nso

11 Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, tukwasi unu madu kari ka unu ra nnù uzọ abua na ọgu uzọ iri, gọzi kwa unu, dika Ọ gwara unu!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha meekwa ka unu mụbaa nʼọnụọgụgụ, puku kwụrụ puku, ya gọziekwa unu dịka o kwere na nkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 1:11
16 Iomraidhean Croise  

O me ka ọ puta n'èzí, Ọ si, Biko, legide anya n'ebe elu-igwe di, gua kpakpando, ọ buru na i puru igu ha: Ọ si ya, Otú a ka nkpuru-gi gādi.


na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya;


M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka! Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi! Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu, Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru, Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.


Joab we si eze, Ka Jehova, bú Chineke-gi, tukwasi-kwa-ra ndi Israel, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise, ka anya onye-nwem, bú eze, hu kwa ya: ma onye-nwem, bú eze, n'ìhi gini ka ihe a nātọ ya utọ?


Joab we si, Ka Jehova tukwasiri ndi-Ya, ka iba-uba ha bara ra, otù onye ọgu ise otù onye ọgu ise: onye-nwem, bú eze, hà abughi ndi-orù onye-nwem nwere, ha nile? n'ìhi gini ka onye-nwem nāchọ ihe a? n'ìhi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?


Ka Jehova tukwasiri unu madu, Ka Ọ tukwasiri unu, tukwasi-kwa-ra umu-unu.


Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.


Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M'meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n'ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ.


Chineke we si Belam, Esola ha je; abula ndi Israel ọnu; n'ihi na ndi agọziri agọzi ka ha bu.


Ha gātukwasi kwa aham n'aru umu Israel; Mu onwem gāgọzi kwa ha.


Jehova, bú Chineke-unu, emewo ka unu ba uba, ma, le, unu di ka kpakpando elu-igwe n'uba, ta.


M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?


Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.


Ọ bu ọgu madu atọ na iri ka nna-gi-hà ji rida n'Ijipt; ma ub͕u a Jehova, bú Chineke-gi, emewo gi ka i di ka kpakpando elu-igwe n'uba.


Unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole, n'ebe unu diri ka kpakpando elu-igwe n'uba; n'ihi na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan