Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 9:17 - Bible Nso

17 Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ge nti n'ekpere orù-Gi na n'aririọ-amara-ya nile, me iru-Gi ka ọ mukwasi ebe nsọ Gi nke tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi Onye-nwe-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 “Ma ugbu a, Chineke anyị, biko nụrụ ekpere na arịrịọ ohu gị. Nʼihi aha gị, Onyenwe anyị jiri amara mee ka ihe si nʼihu gị mụkwasị ụlọnsọ gị nke tọgbọrọ nʼefu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 9:17
20 Iomraidhean Croise  

Ma che iru n'ekpere orù-Gi, na n'aririọ-amara-ya, Jehova, bú Chinekem, ige nti iti-nkpu na ekpere orù-Gi nēkpe n'iru Gi ta:


biko, ka nti-Gi nāṅa nti, ka anya-Gi abua saghe kwa, ka I we ge nti ekpere orù-Gi, nke mu onwem nēkpe n'iru Gi ta, ehihie na abali, bayere umu Israel, bú ndi-orù-Gi, m'nēkwuputa kwa nmehie nile nke umu Israel, nke ayi mehieworo megide Gi: e, mu onwem na ulo nnam emehiewo.


Me ka iru-Gi nye orù-Gi ìhè; Zíkwam ukpuru-Gi nile.


Ọtutu madu nāsi, Ònye gēme ka ayi hu ọdi-nma? Jehova, bulie ìhè iru-Gi ka ọ mukwasi ayi.


Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi, Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah


Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa, Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.


Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi; Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ.


Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.


Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.


Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.


Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha, Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?


Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.


N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.


Olum ka I nuru; ezobela nti-Gi n'iku-umem, na ntikum.


N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.


Onye-nwe-ayi, nuru: Onye-nwe-ayi, b͕aghara: Onye-nwe-ayi, ṅa nti me ihe: anọla ọdu: n'ihi Gi onwe-gi; Chinekem, n'ihi na aha-Gi ka akpọkwasiworo obodo-Gi na ndi-Gi.


Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.


N'ihi na ka ha ra, bú nkwa nke Chineke, ọ bu nime Ya ka e di: n'ihi nka ka Amen site-kwa-ra n'aka-Ya, ka ewe site n'aka-ayi nye Chineke otuto.


Anyanwu ma-ọbu ọnwa adighi kwa obodo ahu nkpà, ka ha mukwasi ya: n'ihi na ebube Chineke nyere ya ìhè, oriọna-ya bu kwa Nwa-aturu ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan