Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 9:13 - Bible Nso

13 Dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n'ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n'ezi-okwu-Gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọ bụ dịka e si dee ya nʼiwu Mosis, ka mbibi a niile bịakwasịrị anyị, ma anyị achọbeghị ihuọma Onyenwe anyị Chineke anyị, na ichegharị site na mmehie anyị chee uche banyere eziokwu gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 9:13
35 Iomraidhean Croise  

Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biarue ebe a, biakwasi kwa ndi bi nime ya, bú okwu nile nke akwukwọ ahu nke eze Juda guworo:


Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi: Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.


Kpughepu anyam abua, ka m'we legide Oké ihe di iche iche si n'iwu-Gi puta.


Me ka m'ghọta uzọ nke ihe-iriba-ama-Gi nile: M'gātughari kwa uche n'oké ọlu-Gi nile.


Aka-Gi abua emewom, me kwa ka m'guzosie ike: Gi me ka m'ghọta ihe, ka m'we muta ihe nile I nyere n'iwu.


Me ka ayi lata, Chineke nke nzọputa-ayi, Me ka ọ gwusia, bú iwe ayi nākpasu Gi.


Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!


Ihe mbu, le, ha abiawo, ọ bu kwa ihe ọhu di iche iche ka Mu onwem nēgosi: tutu ha epue anameme ka unu nuru ha.


Ma ọ bughi Mu ka i kpọkuworo, Jekob; kama ikem agwuwo gi, Israel.


Ayi we di ka onye ruru árú, ayi nile; na dika uwe emeruru emeru, otú a ka ezi omume nile ayi di: ayi we kpọnwua dika akwukwọ osisi, ayi nile; ajọ omume-ayi nēfepu kwa ayi, dika ifufe.


Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi.


Ma ndi nka alaghachikuteghi Onye nētib͕u ha, ọ bughi kwa Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ha chọworo.


N'efu ka M'tib͕uworo umu-unu; ọ dighi ọdidọ-aka-na-nti ha natara: mma-agha-unu erichapuwo ndi-amuma-unu, dika ọdum nke nēbibi ebibi.


Ndi nile ndi nāhu gi n'anya echezọwo gi; ha adighi-achọ gi: n'ihi na otiti nke onye-iro, bú idọ-aka-na-nti nke onye nēnweghi obi-ebere, ka M'wereworo tie gi; n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ihi na nmehie-gi nile nwere ume.


Anuchasiwom ka Efraim nēgosi onwe-ya ebere o nwere n'aru onwe-ya otú a, si, I dọwom aka na nti, ewe dọm aka na nti, dika nwa-ehi nke anēmeghi ka ọ muta ọlu-ya: chighariam, m'we chigharia onwem; n'ihi na Gi onwe-gi bu Jehova, bú Chinekem.


N'ihi na unu esurewo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na n'ihi na unu emehiewo megide Jehova, we ghara ige nti olu Jehova, ghara kwa ijeghari n'iwu-Ya, na n'ukpuru-Ya nile, na n'ihe-àmà-Ya nile; n'ihi nka ka ihe ọjọ a dakwasiworo unu, dika o si di ta.


Le, Mu nāmu anya n'aru ha ime ha ihe ọjọ, ọ bughi ime ha nma: agēme kwa ka ndi Juda nile, bú ndi nọ n'ala Ijipt, gwusia site na mma-agha na site n'oké unwu, rue mb͕e ha gāgwusi.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


Me ka ayi laghachikute Gi, Jehova, ayi gālata kwa; Me ka ubọchi nile ayi di ọhu dika na mb͕e ochie.


N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile?


E, Israel nile agabigawo iwu-Gi, we wezuga onwe-ha, ka ha we ghara ige olu-Gi nti: ewe wukwasi ayi ọb͕ub͕a-ayi ahu na ọṅuṅu-ayi ahu nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, bú orù Chineke; n'ihi na ayi emehiewo megide Ya.


Npako Israel azawo kwa okwu n'iru ya: ma ha alaghachikuteghi Jehova, bú Chineke-ha, ha achọtaghi kwa Ya, n'ihe a nile.


Ha ejighi kwa obi-ha tikuem, kama ha nākwasi ákwá ike n'elu ihe-ndina-ha: n'ihi ọka na manya-vine ọhu ka ha nāchikọta onwe-ha, ha nēwezuga onwe-ha imegidem.


Ha nile di ọku ka ite-ọku uku, ha ewe ripia ndi-ikpe-ha; ndi-eze nile ha adawo n'ala: ọ dighi onye nākpọkum n'etiti ha.


Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ;


Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso),


Edewo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ha nile gābu kwa ndi Chineke zíworo ihe. Onye ọ bula nke nuworo site n'ọnu Nnam, nke mutawo-kwa-ra ihe, ọ nābiakutem.


unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n'orù.


asi na ọ bu ezie na ọ bu Ya onwe-ya ka unu nuru, asi kwa na ọ bu nime Ya ka ezíri unu ihe, dika ezi-okwu di nime Jisus:


ma Jehova enyeghi unu obi imara ama, na anya ihu ahu, na nti inu anu, rue ta.


Ma ọ buru na amam-ihe fọduru onye ọ bula nime unu inwe, ya riọ n'aka Chineke, Onye nēnye madu nile n'afọ-ofufọ, nātaghi kwa uta; agēwere kwa ya nye ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan