Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 8:9 - Bible Nso

9 Ma otù nime ha ka otù mpi ntà siri puta, o we dikarisiri uku, n'uzọ Ndida, na n'uzọ Ọwuwa-anyanwu, na n'uzọ ala ahu mara nma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Otu ntakịrị mpi sitere nʼime otu nʼime mpi ndị ahụ pụta, tokwaa ma buo ibu nke ukwuu ruo na ndịda, na ọwụwa anyanwụ, ruokwa nʼala ọma ahụ

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 8:9
12 Iomraidhean Croise  

O we me ka ndi-Ya mia nkpuru nke-uku; O we me ka ha nwe ume kari ndi nākpab͕u ha.


Ihe mara nma n'idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile, Ka ugwu Zaion bu, n'akuku nile nke Ugwu, Bú obodo Eze ukwu.


Ma Mu onwem siri, M'gēsi aṅa tiye gi n'etiti umu, we nye gi ala anāchọsi ike, ihe-nketa nke mara nma nke usu nile nke mba di iche? M'we si, Nnam ka unu gākpọm; unu agaghi-esi kwa n'isom laghachi azu.


Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n'ọzara, si, na M'gaghi-eme ka ha ba n'ala ahu nke M'nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile;


n'ubọchi ahu ka M'weliri akam nye ha, ime ka ha si n'ala Ijipt puta ba n'ala nke M'ledoro nye ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, nke bu ima-nma nke ala nile:


Ma onye ahu nke nābiakute ya gēme ka o si tọ ya, ọ dighi kwa onye ọ bula ganēguzo n'iru ya; ọ gēguzo kwa n'ala ahu mara nma, ngwusi gādi kwa n'aka-ya.


Ma otù onye eledara anya gēguzo ọtọ n'ọnọdu-ya, onye ha nātukwasighi ebube nke ala-eze: ma ọ gābata nime na mb͕e udo, were ire-utọ nile nata ala-eze ahu.


Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.


ma M'gēfesa ha dika oké ifufe n'etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n'efu n'azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n'ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan