Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 8:22 - Bible Nso

22 Ma mpi ahu, nke b͕ajiri ab͕aji, nke mpi anọ guzoro n'ọnọdu-ya, ala-eze anọ gēsi na mba ahu guzo, ma ọ bughi n'ike-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Dịka mpi ahụ siri gbajie, mpi anọ ọzọ pupụta nʼọnọdụ ya, otu a ka alaeze anọ ga-esi pụta na mba ya, ma ike ha agaghị eru ka nke mbụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 8:22
8 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e o guzoro ọtọ, agētipia ala-eze-ya, kesa ya na nchere-iru ifufe anọ nke elu-igwe; ma ọ gaghi-adiri umu-ya gānọchi ya, ọ gaghi-adi kwa ka ala-ọchichi-ya nke ọ chiri si di; n'ihi na agēropu ala-eze-ya, ọ gādi-kwa-ra ndi ọzọ nābughi ndia.


Mb͕e nka gasiri, anọm nāhu, ma, le, anu ọzọ, dika agu, ma o nwere nkù anọ nke anu-ufe n'azu-ya; ọ bu kwa isi anọ ka anu a nwere; anēnye kwa ya ọchichi.


Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri.


Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.


Ma na mb͕e ikpe-azu nke ala-eze-ha, mb͕e ndi-njehie gējehiezuwori, otù eze gēguzo ọtọ, nke nwere iru di ike, ọ bu kwa onye nāghọta okwu-omimi di iche iche.


M'we welie anyam, hu, ma, le, otù ebulu nēguzo n'iru osimiri ahu nke nwere mpi abua: mpi abua ahu di kwa elu, ma otù di elu kari ibe-ya: ma nke ka elu kpe azu pute.


Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n'olile we pute n'ọnọdu ya chere iru n'ifufe anọ nke elu-igwe.


M'we welie anyam abua ọzọ, hu, ma le, ub͕ọ-ala anọ nēsi n'etiti ugwu abua puta; ugwu ahu bu ugwu ọla.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan