Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 7:28 - Bible Nso

28 N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 “Nke a bụ ọgwụgwụ okwu ahụ. Mụ onwe m, bụ Daniel, echiche m mere ka m tụọ egwu nke ukwu, ihu m gbanwere dịka onye ahụ na-adịghị, ma o nweghị onye ọbụla m gwara ihe m hụrụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 7:28
19 Iomraidhean Croise  

Ọ we kọrọ ya nna-ya, kọkwara umu-nne-ya; nna-ya we basiere ya nba ike, si ya, Gini bu nrọ a nke i rọworo? Mu onwem na nne-gi na umu-nne-gi, àyi gābia n'ezie ikpọ isi ala nye gi?


Umu-nne-ya we kwo ya ekworo; ma nna-ya debere okwu ahu.


Ma, le, otù onye nke di ka oyiyi umu nke madu nēmetu eb͕ub͕ere-ọnum abua aka: m'we saghe ọnum, kwue okwu, si onye ahu nke nēguzo na ncherita-irum, Onye-nwem, site n'ọhù a aru-ufum nile dakwasirim na mberede, m'we ghara inagide ike ọ bula.


Mu onwem we fọduru náním, m'we hu ọhù uku a, ike we ghara ifọdu nimem: n'ihi na ebubem b͕anwere ghọ ihe-nbibi n'arum, m'we ghara inagide ike ọ bula.


Ma eze abua ndia, obi-ha gādi n'ime ihe ọjọ, ọ bu kwa n'otù table ka ha gēkwu okwu-ugha: ma ọ gaghi-aga nke-ọma; n'ihi na ọgwugwu fọduru idi na mb͕e akara àkà.


Ma gi onwe-gi, la, rue ọgwugwu ihe ndia: i gēzu kwa ike, guzo ọtọ n'ebe ekeworo nye gi, n'ọgwugwu ubọchi ndia.


O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.


ka obi-ya b͕anwe ghara ibu obi madu, ka enye kwa ya obi anu-ọhia; ka oge asa gabiga kwa ya n'isi.


Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.


Mb͕e ahu ib͕u-maramara nke iru eze b͕anwere, èchìchè-ya nile nēme kwa ka ọ ma jijij; nkwonkwo úkwù-ya nātọpusi kwa, ikperè-ya abua nākukọrita kwa onwe-ha.


Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m'ma jijiji.


N'arọ nke-atọ nke ọbubu-eze nke Belshaza, bú eze, emere ka m'hu ọhù, bú mu onwem Daniel, mb͕e ọhù ahu nke emere ka m'hu ya n'isi-nmalite gasiri.


O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.


O we si, Le, m'gaje ime ka i mara ihe ahu nke gādi n'ikpe-azu nke oké iwe a: n'ihi na ọ diri mb͕e akara àkà nke ọgwugwu ihe nile.


Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.


Ngwa ngwa ibobo we nwua ìgwè madu ahu nile si-ike n'aru, mb͕e ha huru Ya, ha we b͕akuru Ya, kele Ya.


Ma Meri debere ihe ndia nile ekwuru, nātughari ha n'obi-ya.


O we so ha rida, bia rue Nazaret; Ọ we nọdu n'okpuru ha: nne-Ya we nēdebe ihe nile ekwuru n'obi-ya.


Unu onwe-unu debe okwu ndia na nti-unu: n'ihi na agaje irara Nwa nke madu nye n'aka madu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan